Jeremiah 22

Ikpe ọmụma dịrị ndị eze ọjọọ

1Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Jee nʼụlọeze Juda nọdụ nʼebe ahụ kwusaa ozi ndị a. 2‘Nụrụ okwu Onyenwe anyị, nye gị, gị eze Juda, gị onye na-anọkwasị nʼocheeze Devid. Nụrụ ya, gị na ndịisi ọchịchị gị, na unu ndị niile na-esite nʼọnụ ụzọ ama ndị a na-apụ na-abatakwa. 3Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, Meenụ ihe dị mma na ihe ziri ezi. Napụtanụ onye eji aka ike napụ ihe o nwere site nʼaka onye ahụ na-emegbu ya. Unu emejọkwala onye ọbịa, maọbụ mee ya ihe ike. Unu emekwala ndị na-enweghị nna, maọbụ ndị inyom di ha nwụrụ ihe ọjọọ. Unu awụsịkwala ọbara ndị aka ha dị ọcha nʼebe a. 4Nʼihi na ọ bụrụ na unu elezie anya mee iwu ndị a niile, mgbe ahụ, ndị eze na-anọkwasị nʼelu ocheeze Devid ga-anọgide na-esite nʼọnụ ụzọ ama ndị a na-apụta, na-abata nʼelu ụgbọ agha ha, ma nʼelu ịnyịnya ha, ha na ndịisi ọchịchị ha, na ndị ha na-achị. 5Ma ọ bụrụ na unu ajụ irube isi nye iwu ndị a, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, eji m onwe m na-aṅụ iyi na ụlọeze a ga-aghọ mkpọmkpọ ebe.’ ”

6Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere ụlọeze Juda,

“Ọ bụ ezie na ịdị dịka Gilead nye m,
dịka elu ugwu ukwu Lebanọn,
aghaghị m ime gị ka ị dịrị ka ebe ikpofu ahịhịa,
dịka obodo ndị mmadụ na-ebighị nʼime ya.
7Aga m ezite ndị mbibi ndị ga-abịa megide gị.
Onye ọbụla nʼime ha ga-eji ngwa agha ya.
Ha ga-egbutusịkwa osisi sida ọma gị niile,
tụnye ha niile nʼime ọkụ.
8“Ọtụtụ ndị si mba ọzọ bịa ga-agafe obodo a. Ha ga-ajụrịta ibe ha ajụjụ sị, ‘Gịnị mere Onyenwe anyị ji mee obodo ukwuu a ihe ọjọọ dị otu a?’ 9Ọsịsa ha ga-enweta ga-abụ, ‘Ọ bụ nʼihi na ha gbakụtara ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị Chineke ha azụ, malite ịkpọ isiala na ife chi ndị ọzọ.’ ”

10Unu akwala akwa nʼihi eze ahụ nwụrụ anwụ, maọbụ ruo ụjụ nʼihi na ọ gaghị abụkwa eze unu,
kama kwaanụ akwa nʼihi onye ahụ a dọtara nʼagha buru gaa mba ọzọ.
Nʼihi na ọ gaghị alọghachi ọzọ;
ọ gaghị ahụkwa ala ebe a mụrụ ya anya ọzọ.
11Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere Shalum nwa Josaya, onye nọchiri anya nna ya dịka eze Juda, bụ onye ahụ e si nʼebe a buru gaa mba ọzọ, “Ọ gaghị alọtakwa ọzọ. 12Ebe ahụ e buuru ya gaa ka ọ ga-anọ nwụọ. Ọ gaghị ahụkwa ala nke aka ya anya ọzọ.”

13“Ahụhụ na-adịrị onye ahụ na-ewu ụlọeze ya site nʼụzọ ajọ omume,
nke jikwa ikpe na-ezighị ezi na-ewu ime ụlọ elu ya niile,
onye ahụ nke na-eme ndị mmadụ rụọ ọrụ nʼefu,
nke na-adịghị akwụ ha ụgwọ ọbụla nʼihi ọrụ ha.
14Onye na-asị, ‘Aga m ewuru onwe m ụlọeze buru ibu,
nke ọnụụlọ dị nʼụlọ elu ya sara ezi mbara.’
Ya mere, ọ tinyere oghereikuku sara mbara nʼụlọ ahụ,
jirikwa osisi sida machie elu ya,
werekwa penti
Ya bụ, mgba
na-acha uhie uhie chọọ ya mma.

15“Ị ga-abụ eze
nʼihi na i nwere ọtụtụ osisi sida karịa ndị ọzọ?
Nna gị o nweghị ihe oriri na ihe ọṅụṅụ?
O mere ihe dị mma na ihe ziri ezi
nʼihi ya ihe niile gaara ya nke ọma.
16O kwuchitere ọnụ ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa,
nke a mere na ihe niile gara nke ọma.
Ọ bụghị nke a bụ ihe ọ pụtara bụ ịmara m?
Ka Onyenwe anyị kwupụtara
17Ma anya unu na obi unu
adịghị nʼihe ọzọ ma ọ bụghị naanị nʼuru nʼezighị ezi
nʼiwufu ọbara ndị aka ha dị ọcha,
na imegbu ndị mmadụ, na iji aka ike pụnara ha ihe ha nwere.”
18Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere Jehoiakim nwa Josaya eze Juda:

“Ha agaghị eruru ya uju sị,
‘Ewoo nwanne m nwoke! Ewoo nwanne m nwanyị!’
Ha agaghị eruru ya uju sị,
‘Ewoo nna anyị ukwu! Ewoo ịma mma ya!’
19A ga-eli ya dịka e si eli ịnyịnya ibu.
A ga-adọkpụrụ ozu ya nʼala tufuo ya
nʼazụ ọnụ ụzọ ama Jerusalem.”

20“Gbagoruo na Lebanọn tie mkpu akwa,
meenụ ka a nụ olu unu na Bashan,
sitekwanụ na Abarim tie mkpu akwa
nʼihi na e gweriela ndị niile unu na ha dị na mma.
21Adọrọ m gị aka na ntị nʼoge ahụ ị nọ na-eche na i guzo chịm,
ma ị jụrụ ige ntị.
Nke a bụkwa omume gị site na mgbe ị bụ nwantakịrị.
Ị jụkwara irubere m isi.
22Oke ifufe ga-ebufu ndị ọzụzụ atụrụ gị niile,
a ga-emekwa ka ndị gị na ha dị na mma gaa biri na mba ọzọ.
Mgbe ahụ, ihere ga-eme gị, ị ga-aghọkwa onye e wedara nʼala
nʼihi ajọ omume gị niile.
23Gị onye na-ebi na Lebanọn,
Nke a bụ ụlọeze ahụ dị na Jerusalem, hụ nke a na 1Ez 7:2

onye ebe obibi ya dị nʼụlọ e ji osisi sida wuo,
lee ka i si
Akwụkwọ ndị ọzọ ga-ede; lee ka ị si bụrụ onye a ga-emere ebere mgbe ihe mgbu
na-asụ ude mgbe ihe mgbu bịakwasịrị gị,
ihe mgbu yiri nke nwanyị ime na-eme.
24“Ma dịka m na-adị ndụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya, “a sịkwarị na gị, bụ Jehoiakin, nwa Jehoiakim eze Juda, bụ mgbaaka akara m gbanyere na mkpịsịaka dị nʼaka nri m, aga m agbapụkwa gị, 25were gị nyefee nʼaka ndị ahụ na-achọsi ndụ gị ike, bụ ndị ahụ ị na-atụ ụjọ ha. Aga m enyefe gị nʼaka Nebukadneza eze Babilọn na ndị Kaldịa. 26Aga m atụfu gị na nne mụrụ gị, tụga unu na mba ọzọ dị iche site nʼobodo a nọ mụọ unu. Ebe ahụ ka unu ga-anọ nwụọ. 27Unu agaghị alọghachikwa nʼala ahụ na-agụ unu agụụ ịlọghachi nʼime ya.”

28Nwoke a bụ Jehoiakin, ọ bụ ite tiwara etiwa, nke e lelịrị elelị,
ihe onye ọbụla na-achọghị?
Nʼihi gịnị ka a ga-eji tufuo ya na ụmụ ya,
tụga ha na mba ha na-amaghị?
29Ala, ala, ala,
nụrụ okwu Onyenwe anyị.
30Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru:
“Detuo ya nʼakwụkwọ na nwoke a bụ onye gba aka nwa,
nwoke nke ihe na-agaghị agara nke ọma nʼoge ndụ ya niile,
nʼihi na o nweghị onye nʼime ụmụ ọ mụrụ nke ihe ga-agara nke ọma,
o nwekwaghị onye nʼime ha ga-anọkwasị nʼocheeze Devid,
maọbụ chịakwa ọzọ na Juda.”
Copyright information for IboBIU